Psalms 125

Abụ nrigo.

Chineke onye na-echebe ndị ya

1Ndị niile na-atụkwasị Onyenwe anyị obi na-anọgidesi ike dị ka ugwu Zayọn
nke a na-apụghị inugharị, nke na-adịgidekwa nʼọnọdụ ya ruo mgbe ebighị ebi.
2Dịka ugwu niile si gbaa obodo Jerusalem gburugburu,
otu a ka Onyenwe anyị na-agba ndị ya gburugburu
ugbu a na ruo mgbe ebighị ebi.

3Mkpara ọchịchị ndị ajọ omume agaghị adịgide a
nʼala ndị ezi omume ketara nʼife nza,
nʼihi na ndị ezi omume nwere ike
itinye aka ha na-ime ihe ọjọọ.

4O Onyenwe anyị, meere ndị niile na-eme ezi omume ihe ọma,
ya bụ, ndị niile obi ha ziri ezi.
5Ma Onyenwe anyị ga-achụpụ ndị niile na-agbaso ụzọ aghụghọ
na ndị niile na-eme ajọ ihe.

Ka udo dịrị Izrel.
Copyright information for IboBIU